JEMES 1:16-25
JEMES 1:16-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m. Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke. Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.
JEMES 1:16-25 Bible Nso (IGBOB)
Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta. N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè. Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe: n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke. N'ihi nka tupunu inyi nile na njubiga-ókè nile nke ihe ọjọ, were-kwa-nu nwayọ nara okwu ahu nke akuworo nime unu dika n'ubi, nke puru izọputa nkpuru-obi-unu. Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu. N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya: n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu. Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.