JEMES 1:12-13
JEMES 1:12-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya. Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.
Kesaa
Gụọ JEMES 1JEMES 1:12-13 Bible Nso (IGBOB)
Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya. Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula
Kesaa
Gụọ JEMES 1