AISAIA 9:1-3
AISAIA 9:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan. Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị. I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
AISAIA 9:1-3 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke mba nile. Ndi nējeghari n'ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n'ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha. I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.