AISAIA 66:9-14
AISAIA 66:9-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka ONYENWE ANYị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ. “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya. Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.” Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya. Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka ONYENWE ANYị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
AISAIA 66:9-14 Bible Nso (IGBOB)
Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M'gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri. Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n'ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n'anya: ka obi tọ unu utọ n'ebe ọ nọ site n'obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya: ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n'akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n'ikperè ka agātughari unu. Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi. Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.