AISAIA 6:1-3
AISAIA 6:1-3 Bible Nso (IGBOB)
N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke. Ndi-seraph nēguzo n'elu ya: nkù isi nkù isi ka seraph ọ bula nime ha nwere; abua ka o ji ekpuchi iru-ya, abua ka o ji ekpuchi ukwu-ya abua, abua ka o ji efe efe. Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.
AISAIA 6:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.”