AISAIA 55:8-12
AISAIA 55:8-12 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. N'ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka èchìchèm nile di elu kari èchìchè nile unu. N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe; otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya. N'ihi na ọṅù ka unu gēji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọṅù, n'iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha.
AISAIA 55:8-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.