AISAIA 55:1-2
AISAIA 55:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
AISAIA 55:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnweghi ego; bianu, zuru ọka, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējighi ego nārùghi ọnu-ahia. N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.