Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 52:1-15

AISAIA 52:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Teta, teta gị Zayọn, yikwasị onwe gị ike dịka uwe! Yikwasị onwe gị uwe mara mma, gị Jerusalem, obodo dị nsọ. Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ agaghị abata nʼime gị ọzọ. Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha. Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYị sịrị, “Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla, ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.” Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru, “Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri, ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha. “Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe ONYENWE ANYị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile. Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.” Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!” Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe ONYENWE ANYị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya. Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na ONYENWE ANYị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem. ONYENWE ANYị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị. Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ ONYENWE ANYị. Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na ONYENWE ANYị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ. Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ. Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.

AISAIA 52:1-15 Bible Nso (IGBOB)

Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n'ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n'ub͕u a. Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha. N'ihi na otú a ka Jehova siri, N'efu ka erere unu; ọ bughi kwa ego ka agēji b͕aputa unu. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ bu Ijipt ka ndim ridaruru na mbu inọ n'ebe ahu dika ọbìa: Asiria kwa, n'efu ka ọ meb͕uru ha. Ma ub͕u a, gini ka M'nwere ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ewepuwo ndim n'efu? ndi nāchi ha nākwasi ákwá ike, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa mb͕e nile n'ogologo ubọchi nile ka anēlelì aham. N'ihi nka ka ndim gāmara aham: n'ihi nka ka ha gāmara n'ubọchi ahu na Mu onwem bu Onye ahu Nke nēkwu okwu; lekwam. Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze! Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion. Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem. Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi. Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova. N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel. Le, orùm gēnwe uche, ọ gādi elu, agēbuli kwa ya, o we di elu nke-uku. Dika ibobo gi si anwu ọtutu madu n'aru, (le ka iru-ya si buru ihe bibiri ebibi nke-uku kari onye ọ bula, udi-aru-ya kwa kari umu madu!) otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara