AISAIA 51:1-6
AISAIA 51:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu. Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba. N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma. Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n'ihi na otù iwu gēsi n'ọnum puta, M'gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile. Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere. Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem.
AISAIA 51:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ ONYENWE ANYị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya! Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. ONYENWE ANYị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke ONYENWE ANYị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè. Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha. Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.