Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 51:1-23

AISAIA 51:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ ONYENWE ANYị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya! Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. ONYENWE ANYị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke ONYENWE ANYị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè. Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha. Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ. Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu. Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka ONYENWE ANYị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ? Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee? Ndị ahụ ONYENWE ANYị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga. “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa, na ị na-echefu ONYENWE ANYị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị? Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha. Nʼihi na abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ” Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka ONYENWE ANYị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa. Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso. Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi? Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma ONYENWE ANYị na ịba mba nke Chineke gị. Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya. Lee ihe ONYENWE ANYị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ. Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”

AISAIA 51:1-23 Bible Nso (IGBOB)

Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu. Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba. N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma. Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n'ihi na otù iwu gēsi n'ọnum puta, M'gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile. Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere. Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem. Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha. N'ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile. Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri? Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga? Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia; i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n'ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di? Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ. Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu. Teta, teta, bilie Jerusalem, nke siworo n'aka Jehova ṅua iko nke ọnuma-Ya; ọkwa ahu, bú iko nke isu-ngọngọ, ka i ṅuworo, ṅusia. Ọ dighi onye-ndú o nwere n'etiti umu-ndikom nile ọ muworo: ọ dighi kwa onye nējide aka-ya n'etiti umu-ndikom nile o meworo ka ha tozue okè. Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n'aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M'gēsi aṅa kasie gi obi? Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi. N'ihi nka, biko, nuru nka, gi nwanyi ewedara n'ala, nke ihe nēb͕u kwa, ma ọ bughi manya-vine: otu a ka Onye-nwe-gi siri, bú Jehova, na Chineke-gi Nke nēkpe ọnu ndi-Ya n'ikpe, Le, ewepuwom n'aka-gi iko nke isu-ngọngọ, bú ọkwa ahu nke bu iko nke ọnumam; i gaghi-aṅu kwa ya ọzọ: ma M'gētiye ya n'aka ndi nēmekpa gi aru; ndi siri nkpuru-obi-gi, Ruda n'ala, ka ayi we gabiga: i we me ka azu-gi di ka ala na dika èzí nye ndi nāgabiga.