AISAIA 50:7-10
AISAIA 50:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem. Onye nāgum n'onye ezi omume di nso: ọdi onye mu na ya gēkpe? ka ayi guzo ọtọ n'otù: ònye bu onye ahu nwere okwu-ikpe ikwugidem? ya biakutem nso. Le, Onye-nwe-ayi Jehova gēyerem aka: ònye bu onye ahu gāmam ikpe? le, ha nile gāka dika uwe; nla gērichapu ha. Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.
AISAIA 50:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m. Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya. Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha. Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu ONYENWE ANYị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha ONYENWE ANYị daberekwa na Chineke ha.