AISAIA 48:17-22
AISAIA 48:17-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka ONYENWE ANYị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.” Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “ONYENWE ANYị agbapụtala ohu ya Jekọb.” Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta. ONYENWE ANYị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”
AISAIA 48:17-22 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri: nkpuru-gi gādiwo-kwa-ri ka ájá, umu nke si n'afọ-gi puta di ka umu-ihe si n'afọ oké osimiri ahu puta: agaghi-ebipuwori aha-ya ma-ọbu kpochapu ya n'irum. Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob. Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa. Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.