AISAIA 45:1-7
AISAIA 45:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nke a ka ONYENWE ANYị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. Ọ bụ m bụ ONYENWE ANYị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike. Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m ONYENWE ANYị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị, na-eme ihe ndị a niile.
AISAIA 45:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama; Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa: M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel. N'ihi orùm, bú Jekob, na Israel nke M'rọputara, ka M'nākpọ gi n'aha-gi: anametu gi aha, ọ bu ezie na i maghm. Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di; ma ewezuga náním ọ dighi Chineke ọ bula di: M'nēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, ọ bu ezie na i maghm: ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di. Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.