AISAIA 44:6-8
AISAIA 44:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem. Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n'usoro, site na mb͕e M'doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n'iru, na nke gābia, ka ha gosi ha. Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.
AISAIA 44:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m. Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya. Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ! Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike. Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro, ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”