AISAIA 43:18-21
AISAIA 43:18-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha. Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
AISAIA 43:18-21 Bible Nso (IGBOB)
Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi. Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu. Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara: ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.