AISAIA 43:1-7
AISAIA 43:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ugbu a, nke a bụ ihe ONYENWE ANYị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m. Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel. Ewerela m Ijipt na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ. Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi, onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”
AISAIA 43:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu. Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku. N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi. Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n'anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n'anya; ya mere M'gēnye madu n'ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n'ọnọdu ndu-gi. Atula egwu; n'ihi na gi ka M'nọyere: M'gēme ka nkpuru-gi si n'Ọwuwa-anyanwu bia, M'gēsi kwa n'Ọdida-anyanwu chikọta gi; M'gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n'ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia; onye ọ bula nke anākpọ n'aham, nke M'kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya.