AISAIA 36:4-22
AISAIA 36:4-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m? Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?” “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado ONYENWE ANYị? ONYENWE ANYị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ” Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu. Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị ONYENWE ANYị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, ONYENWE ANYị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’ “Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya. “Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘ONYENWE ANYị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa. Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m? Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na ONYENWE ANYị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?” Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.” Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.
AISAIA 36:4-22 Bible Nso (IGBOB)
Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi? Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum? Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ. Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala? Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya? Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya. Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi. Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri? Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria. Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu: n'ihi na ọ pughi inaputa unu: unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi; agaghi-enye obodo a n'aka eze Asiria. Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya: rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine. Lezienu anya ka Hezekaia we ghara irafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria? Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim di? hà anaputawo kwa Sameria n'akam? Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam? Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya. Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.