AISAIA 36:1-10
AISAIA 36:1-10 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, na Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha. Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà. Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ya. Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi? Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum? Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ. Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala? Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya? Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya.
AISAIA 36:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha. Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa. Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya. Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m? Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?” “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado ONYENWE ANYị? ONYENWE ANYị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”