AISAIA 33:15-16
AISAIA 33:15-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
AISAIA 33:15-16 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya; onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.