AISAIA 30:19-21
AISAIA 30:19-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
AISAIA 30:19-21 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n'ezie n'olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu. Onye-nwe-ayi gēnye kwa unu nri ahuhu na miri nmeb͕u, ma ndi-ozizí-gi agaghi-ezobe onwe-ha ọzọ, kama anya-gi abua ganāhu ndi-ozizí-gi: nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.