AISAIA 28:9-13
AISAIA 28:9-13 Bible Nso (IGBOB)
Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara? N'ihi na ọ bu ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī n'ebe a, nwantī n'ebe ahu. N'ezie site n'isu-nsu nke eb͕ub͕ere-ọnu na site n'ire di iche ka Ọ gāgwa ndi nka okwu: bú Onye siri ha, Nka bu izu-ike ahu, menu ka onye ike gwuru zuru ike; nka bu kwa igba ume ahu: ma ha ekweghi inu. Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha.
AISAIA 28:9-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara? Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.” Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe. Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị. Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu ONYENWE ANYị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.