HOSEA 4:1-2
HOSEA 4:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka. Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.
Kesaa
Gụọ HOSEA 4HOSEA 4:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYị unu ndị Izrel, nʼihi na ONYENWE ANYị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile. Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
Kesaa
Gụọ HOSEA 4