HOSEA 14:4-8
HOSEA 14:4-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
HOSEA 14:4-8 Bible Nso (IGBOB)
M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia. M'gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, b͕asa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon. Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon. Ndi bi n'okpuru ǹdò-ya gālata, me ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine: ihe-ncheta-ya gādi ka manya-vine nke Lebanon. Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.