NDI-HIBRU 9:11-28
NDI-HIBRU 9:11-28 Bible Nso (IGBOB)
Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a, O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi. N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha: ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu? Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu. N'ihi na ebe ọb͕ub͕a-ndu di, ọ di nkpà ka ọnwu nke onye b͕ara ya di ya. N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu nēguzosi ike n'elu ndi nwuru anwu: n'ihi na ò nwere uzọ ọ gābu ihe di ike mb͕e ọ bula onye b͕ara ya di ndu? Ya mere emeghi ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu ọhu nējighi ọbara. N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile, si, Nka bu ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke nyere unu n'iwu. O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu. Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi. Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n'elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n'elu-igwe ka ha di ọcha. N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a: ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n'iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n'ebe nsọ kwa-arọ; n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè. Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya; n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.
NDI-HIBRU 9:11-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ. Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla. Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ. Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya. Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile. Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.” Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe. Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị. O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa. Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke. Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ. Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.