NDI-HIBRU 8:10-12
NDI-HIBRU 8:10-12 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'uche-ha, Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ: M'gābu-kwa-ra ha Chineke, Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi: Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya, Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi: N'ihi na ha nile gāmatam, Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha. N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.
NDI-HIBRU 8:10-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”