NDI-HIBRU 8:1-6
NDI-HIBRU 8:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya. A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja. A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị. Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.” Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.
NDI-HIBRU 8:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe, Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu. N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke. Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ: ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu. Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.