NDI-HIBRU 7:1-3
NDI-HIBRU 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n'ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya, onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo; enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.
NDI-HIBRU 7:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.