NDI-HIBRU 4:1-13
NDI-HIBRU 4:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya. Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya. Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa. Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.” Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.” Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi. O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.” Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ. Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke. Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya. Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha. Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
NDI-HIBRU 4:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n'izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n'etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya. N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie. N'ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n'izu-ike ahu; dika O kwuworo, si, Dika M'ṅuru iyi n'iwem, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli: ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa. N'ihi na O kwuwo n'otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n'ubọchi nke-asa n'ọlu-Ya nile; ọzọ, Ọ si kwa n'ebe a, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli. Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye, O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike. N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri. Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke. N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya. Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye. N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi. Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.