Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 2:9-18

NDI-HIBRU 2:9-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ. Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.

NDI-HIBRU 2:9-18 Bible Nso (IGBOB)

Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula. N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè. N'ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n'otù Nna: ọ bu kwa n'ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya, Ọ si, Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi. Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem. Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu; ka O we site kwa n'ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n'ibu-orù n'ogologo ndù-ha nile. N'ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka. O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di. N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.