NDI-HIBRU 13:12-15
NDI-HIBRU 13:12-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
NDI-HIBRU 13:12-15 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo. Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya. N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia. Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.