NDI-HIBRU 13:12-14
NDI-HIBRU 13:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
Kesaa
Gụọ NDI-HIBRU 13NDI-HIBRU 13:12-14 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo. Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya. N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia.
Kesaa
Gụọ NDI-HIBRU 13