NDI-HIBRU 12:14-29
NDI-HIBRU 12:14-29 Bible Nso (IGBOB)
Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya: nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu; ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri. N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike. N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe, na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ: n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya; ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji: kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu, bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè, na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru. Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe: Onye olu-Ya mere uwa ka o me nkpatu mb͕e ahu: ma ub͕u a ka O kweworo nkwa, si, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru nke Mu onwem gēji me ka ọ bughi nání uwa ma jijiji, kama elu-igwe kwa. Ma okwu nka, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru, nēgosi nbubiga nke ihe ahu nke anēme ka ha me nkpatu, dika nke ihe emeworo, ka ihe ahu nke anēmeghi ka ha me nkpatu we digide. N'ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n'uzọ nke gātọ Chineke utọ: n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.
NDI-HIBRU 12:14-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị. Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ. Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri. Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike. Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha. Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.” Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.” Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ. Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke. Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru. Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị. Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị. Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.