NDI-HIBRU 12:1-6
NDI-HIBRU 12:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba. Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”
NDI-HIBRU 12:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru, nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke. na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu. Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie: unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya; N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.