Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 12:1-11

NDI-HIBRU 12:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba. Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya. Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.

NDI-HIBRU 12:1-11 Bible Nso (IGBOB)

Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru, nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke. na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu. Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie: unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya; N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari. Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu? Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie. Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu? N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya. Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.