NDI-HIBRU 11:8-16
NDI-HIBRU 11:8-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga. Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ. Nʼihi na ọ na-ele anya ala ahụ nke nwere ntọala, nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke. Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi. Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa. Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha. Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
NDI-HIBRU 11:8-16 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje. Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu: n'ihi na ọ nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọ̀kà-ya na onye luru ya. Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n'Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa: ọ bu kwa n'ihi nka ka esitere n'otù nwoke mu umu, mb͕e ọ di kwa ka onye nwuru anwu, bú umu bara uba dika kpakpando nke elu-igwe, di kwa ka ájá, nke di n'usọ oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu ya. Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa. N'ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha. Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi. Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo.