Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 11:23-40

NDI-HIBRU 11:23-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere. Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie. O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu. Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya. O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka. Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile. Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa. Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo. Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma, ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.

NDI-HIBRU 11:23-40 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu. Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero; n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge; ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu. Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n'ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n'ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya. Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka. Okwukwe ka ha ji gabiga n'etiti oké osimiri Uhie dika ọ bu ala kpọrọ nku: ma elomiri ndi Ijipt mb͕e ha nwara igabiga ya. Okwukwe ka mb͕idi nke Jeriko ji da, mb͕e agasiri ha gburugburu ubọchi asa. Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya. Gini ka m'gēkwu kwa ọzọ? n'ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma: ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum, menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ. Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma: ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ: aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha (ndi uwa nēkwesigh), nāwaghari n'ọhia na ugwu na ọb͕à na ọnu nke ala. Ndia nile, ọ bu ezie na ab͕ara ha àmà site n'okwukwe-ha, ma ha anataghi nkwà ahu, n'ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma bayere ayi, ka aghara ime ka ha zue okè ma asi na ayi anọghi ya.