NDI-HIBRU 11:13-16
NDI-HIBRU 11:13-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa. Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha. Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
NDI-HIBRU 11:13-16 Bible Nso (IGBOB)
Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa. N'ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha. Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi. Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo.