NDI-HIBRU 10:35-39
NDI-HIBRU 10:35-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.
NDI-HIBRU 10:35-39 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu. N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu. N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra, Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù. Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma. Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.