NDI-HIBRU 10:24-25
NDI-HIBRU 10:24-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
Kesaa
Gụọ NDI-HIBRU 10NDI-HIBRU 10:24-25 Bible Nso (IGBOB)
ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche; ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.
Kesaa
Gụọ NDI-HIBRU 10