HABAKUK 2:2-20
HABAKUK 2:2-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ ONYENWE ANYị zara m sị, “Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka. “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ. Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. Ọ bụ na ọ bụghị uche ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube ONYENWE ANYị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri ONYENWE ANYị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere. Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” Ma ONYENWE ANYị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
HABAKUK 2:2-20 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we zam, si, De ọhù ahu n'elu mbadamba-ihe di iche iche, tu ya akika, ka onye nāgu ya we b͕a ọsọ. N'ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n'ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù. Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu. E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ. Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya! Ọ̀ bughi n'otù ntabi-anya ka ha gēbili, bú ndi nāta gi aru, ka ha gēteta, bú ndi nēme ka i ma jijiji, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-npunara? N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya. Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n'elu, ka ewe naputa ya n'ọbu-aka ihe ọjọ! I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi. N'ihi na nkume gēsi na mb͕idi tie nkpu, ntuhie gēsi kwa n'osisi di n'ulo za ya. Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike! Le, ò siteghi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha na ndi di iche iche nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nye ọku, na ike nāgwu kwa mba nile n'efu? N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri. Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya! Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi. N'ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya. Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche? Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya. Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.