HABAKUK 1:1-4
HABAKUK 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru. Jehova, rùe ole mb͕e ka m'ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m'nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa. N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya. N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.
HABAKUK 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara. ONYENWE ANYị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta? Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.