JENESIS 9:13-15
JENESIS 9:13-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa. Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe, aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
JENESIS 9:13-15 Bible Nso (IGBOB)
eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa. Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu, M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.