JENESIS 6:9-21
JENESIS 6:9-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya. Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet. Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ. Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya. Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya. Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara. Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu. Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi. Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom. Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ. Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ. Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”
JENESIS 6:9-21 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari. Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet. Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike. Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa. Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa. Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gopher; ulo-nwubi di iche iche ka i gēme n'ub͕ọ ahu, were kwa bitumen techie ya ime na azu. Nka bu kwa otú i gēme ya: ọgú cubit iri-na-ise ka ogologo ub͕ọ ahu bu, ọgu cubit abua na iri bu obosara-ya, orú cubit na iri bu idi-elu-ya. Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n'elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya. Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume. Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi. Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n'aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n'ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu. Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu. Gi onwe-gi kwa, were n'onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n'ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri.