JENESIS 45:4-8
JENESIS 45:4-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.
JENESIS 45:4-8 Bible Nso (IGBOB)
Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt. Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu. N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi. Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu. Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.