JENESIS 45:16-28
JENESIS 45:16-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ. Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan. Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ. “Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu. Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ” Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ. O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise. O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya. O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.” Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha. Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu. Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri. Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”
JENESIS 45:16-28 Bible Nso (IGBOB)
Ewe nu ùdé-ya n'ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya. Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n'ala Kenean; chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka. Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n'ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n'ihi umu-ntakiri-unu, na n'ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia. Anya-unu adi-kwa-la n'ihe-unu; n'ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya. Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n'okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n'uzọ. Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise. O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ. Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ. Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha. Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha. Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu: Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.