JENESIS 45:1-15
JENESIS 45:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ. O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara. Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya. Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile. Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m. Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere. Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’ “Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a. Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.” Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa. Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka.
JENESIS 45:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya. Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara. Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya. Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt. Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu. N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi. Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu. Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile. Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ: i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere: m'gāzù kwa gi n'ebe ahu; n'ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere. Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu. Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n'Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n'ebe a. Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n'olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n'olu-ya. Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.