JENESIS 42:35-38
JENESIS 42:35-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu. Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!” Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.” Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”
JENESIS 42:35-38 Bible Nso (IGBOB)
O rue na, mb͕e ha nāwupu ihe di n'akpa-ha, le, ngwungwu ego nwoke ọ bula di n'akpa-ya: ha we hu ngwugwu ego-ha, ha onwe-ha na nna-ha, ha we tua egwu. Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo. Reuben we gwa nna-ya okwu, si, Umum ndikom abua ka i gēme ka ha nwua, ma ọ buru na emeghi m ka ọ biakute gi: nye ya n'akam, mu onwem gēme kwa ka ọ laghachikute gi. Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.