JENESIS 42:18-38
JENESIS 42:18-38 Bible Nso (IGBOB)
Josef we si ha n'ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n'ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu: ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n'ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n'ihi oké unwu nke ulo-unu: ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a. Ha we sirita onwe-ha, N'ezie ndi ikpe maworo bayere nwa-nne-ayi ka ayi bu, n'ihi na ayi huru nkpab͕u nke nkpuru-obi-ya, mb͕e ọ nāriọ ayi aririọ-amara, ma ayi anughi; n'ihi ya ka nkpab͕u a biakwasiworo ayi. Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya. Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha. O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha. Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a. Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la. Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya. Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n'akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n'etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi? Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si, Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala. Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo: umu-nne iri na abua ka ayi bu, umu nke nna-ayi; otù anọghi ndu, nke-ntà di kwa n'aka nna-ayi taa n'ala Kenean. Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m'gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n'akam, ma werenu ọka n'ihi oké unwu nke ulo-unu, la: ma menu ka nwa-nne-unu nke-ntà biakute m: ka m'mara kwa na ọ dighi ndi-nledo unu bu, kama unu bu ndi ziri ezi: nwa-nne-unu ka m'gēnye unu, ọ bu kwa n'ala nka ka unu gāzu ahia. O rue na, mb͕e ha nāwupu ihe di n'akpa-ha, le, ngwungwu ego nwoke ọ bula di n'akpa-ya: ha we hu ngwugwu ego-ha, ha onwe-ha na nna-ha, ha we tua egwu. Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo. Reuben we gwa nna-ya okwu, si, Umum ndikom abua ka i gēme ka ha nwua, ma ọ buru na emeghi m ka ọ biakute gi: nye ya n'akam, mu onwem gēme kwa ka ọ laghachikute gi. Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.
JENESIS 42:18-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ. Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a. Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.” Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.” Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha. O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya. Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa. Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya. Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?” Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị, “Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha. Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo. Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’ “Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu. Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ” Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu. Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!” Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.” Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”