JENESIS 42:1-17
JENESIS 42:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya” Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.” Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka. Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya. Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan. Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef. Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.” Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ. Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.” Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri. Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.” Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.” Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu. Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a. Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.” O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.
JENESIS 42:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Jekob we hu na ọka di n'Ijipt, Jekob we si umu-ya ndikom, N'ìhi gini ka unu nēlerita onwe-unu anya? Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n'Ijipt: ridanu n'ebe ahu, si n'ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu. Umu-nne Josef iri we rida isi n'Ijipt zuta ọka. Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n'ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya. Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean. Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala. Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri. Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya. Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo. Ha si ya, É-è, onye-nwem, kama ndi-orù-gi abiawo izuru ihe-oriri. Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo. Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu. Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu. Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m'gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu: nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n'ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n'ebe a. Ziganu otù nime unu, ya kute nwa-nne-unu; ma unu onwe-unu, ka eke unu ab͕u, ka ewe nwaputa okwu nile unu, ma ezi-okwu di nime unu: ma ọ buru na ọ dighi otú a, Fero di ndu! ndi-nledo ka unu bu n'ezie. Ọ we chikọta ha tiye n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ ubọchi atọ.