Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 41:14-36

JENESIS 41:14-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero. Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.” Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.” Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m. Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi. Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile. Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta. Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra. “Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya. Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha. Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.” Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime. Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ. Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị. “Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime. Afọ asaa na-abịa ga-abụ afọ asaa mgbe nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt niile. Emesịa afọ asaa oke ụnwụ ga-eso ha. Mgbe ahụ, a ga-echefu ụba niile nke ala Ijipt. Ụnwụ a ga-ala obodo nʼiyi. Agaghị echetakwa na e nwere oge ịba ụba ihe oriri nʼala a, nʼihi oke ụnwụ ahụ nke ga-eso ya ga-adị oke ukwuu. Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya. “Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile. Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt. Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche. A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”

JENESIS 41:14-36 Bible Nso (IGBOB)

Fero we ziga kpọ Josef, ha we me ka o si n'olùlù ahu b͕aputa: ọ kọpu isi-ya, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya nile, bakute Fero. Fero we si Josef, Nrọ ka m'rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya. Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero. Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m'nēguzo n'usọ osimiri Nail: ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara abuba n'anu-aru-ha, ma kwa nma n'aru; ha we ta nri n'etiti ubi: ma, le, ehi asa ọzọ nārigoputa n'azu ha, ha adighi nma, jọ njọ n'aru nke-uku, ta kwa aru n'anu-aru-ha, ahughm otú ndi ahu n'ijọ-njọ n'ala Ijipt nile: ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba: ma mb͕e ha basiri n'afọ-ha, amaghi na ha barari n'afọ-ha; ma ha jọrọ njọ ile anya, dika na nmalite. M'we teta. M'we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma: ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu: oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya. Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero. Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu. Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu. Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya. Le, arọ asa nābia nke aganēriju afọ nke-uku n'ala Ijipt nile: arọ asa nke oké unwu gēbili kwa ma ndia gasia; agēchezọ kwa iriju-afọ nile n'ala Ijipt; oké unwu ahu gēb͕upia ala ahu; agaghi-ama iriju-afọ ahu n'ala nka n'ihi oké unwu ahu nke nēso ya; n'ihi na arọ́ ka ọ gādi nke-uku. Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya. Ma ub͕u a, ka Fero leputa nwoke nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, ka o do kwa ya onye-isi ala Ijipt nile. Ka Fero me nka, me kwa ka ndi-nlekọta ala nka, ka ọ were kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ala Ijipt n'arọ asa ahu anēriju afọ. Ka ha chikọta kwa ihe-oriri nile nke ezi arọ ndia nke nābia, ka ha kwakọba kwa ọka n'okpuru aka Fero ibu ihe-oriri n'obodo Ijipt nile, ka ha debe kwa ya. Ihe-oriri ahu gābu ihe agēdebere ala nka rue arọ asa nke oké unwu ahu nke gādi n'ala Ijipt; ka ewe ghara ibipu ala nka n'oké unwu ahu.